Anaghim aru oru n’ulo anam aru na ofis - e nwerem ike inye nwa ara otu ahu

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Anaghim_aru_oru_n%E2%80%99ulo_anam_aru_na_ofis_-_e_nwerem_ike_inye_nwa_ara_otu_ahu

Otutu umu nwanyi anaghi aru oru n’ulo. Nkea a na eme ya osie obere ike inye nwa nri na abughi ara site na oge amuru ya ruo onwa isii. Ma nwa gi nwere ike iria oria ma o buru na onwetaghi nri a. Nwanyi na-aru oru ekwesighi iha otu n’ime ihe nabo a n’ihi na ha abuo di ezigbo mkpa nke ukwuu.

Nke a bu ihe kpatara umu nwanyi na aru oru ji kwesi inwe nghota na enyemaka onye obula. Ufodu ulo oru na ekwe ka umu nwanyi kpota nwa ha na ofis ka inye ha ara wee diri ha mfe. Nkea na enyere ezi aka. O buru na nwanyi nwere dakia (day care) nso, onwere ike idi na aga ebe ahu nye nwa nri n’ihi na otutu ulo oru na akwado nkea ka o wee diri umunwayi mfe iru oru ma nye nwa nri.

Lee ufodu uzo i ga esi hu na nwa gi nwetara nani mmiri ara ma o buru na i na aru oru:

  • Debe nwa gi nso na afo isii ohuru ahu.
  • Hu na mmadu na akpotara gi nwa ma oruo oge nri ya
  • Gi na nwa noro, nye ya nri na agbanyelaya n’iko obula. Gi na ya na arahu ura n’otu ebe na abali, hapu ya ka o na eri nri. Nke a ga enyere gi aka, imeputawanye mmiri ara
  • Ufodu umu nwanyi na ufodu obodo na agwa ndi enyi ha ma o bu nne ha ka ha nyere ya nwa ya ara. O buru na imenwuru nke a, gbaa mbo hu na emere onye ahu nleta HIV.
  • Uso ozo bu oburu na nwanyi a nwere ohere igbanye ya na fidin botul, onye ozo nwere ike inye ya nwa. I nwere ike ime nkea ugboro abuo ma o bu ato na ubochi.

OKWU DI OKE MKPA: mmiri ara agbaputara agbapu, ana edebenwughi ebe o ga aju oyi kwesiri ka etufuo ya. O buru na o na esi isi, tufuo ya ozugbo ozugbo. Enyekwala ya nwa mancha n’ihi na o ga emeru nwa ezigbo ahu.


Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010808