E kwesiri igba umu aka niile ogwu mgbochi

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/E_kwesiri_igba_umu_aka_niile_ogwu_mgbochi

Otutu ndi nne na nna adighi akpoga umu ha iga gba ogwu mgbochi n’ihi na nwa ahu adighi aria nnukwu oria, soso ndi obere dika ahu oku, ukwara, oyi, afo osisa mana o ka mma na umu aka nwetara mkpuchi o burugodi na ha na aria obere oria.

O nwekwaghi ihe o mere igba nwa ogwu ma o buru na o nwere malnutrition ma o bu disability. O buru na nwa nwere HIV, ma o bu na e chere na o nwere ya, a ga acho iju onye okachamalu udi ogwu ekwesiri igba ya.

Agbachaa ogwu, nwa nwere ike ibe akwa ma o bunwee ahu oku ma o bu obere onya. O bu otua ka o kwesiri isi di. O na egosi na ogwu ahu na aru oru. Umuaka na erubeghi onwa isii kwesiri ka enye ha ara ugboro ugboro, ndi kariri onwa isii kwesiri ka enye ha nnukwu mmiri na nri. O buru na nwatakiri ahu nwe ahuoku di egwu (nke kariri 38 digrees selsios) ekwesiri ikporo gaa n’ulo ogwu.

Mizuls adighi mma ma ncha nyere umu aka nwere malnutrition. Hu na agbara umuaka ogwu gbasara ya okachasi ma o buru na malnutrition ahu na akwanye njo.
Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020706