Enwerem ike inwe mmeko nwoke and nwanyi ga ejum afo

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Enwerem_ike_inwe_mmeko_nwoke_and_nwanyi_ga_ejum_afo

Otutu ndi mmadu na eche na umu nwanyi ahu na ezughi oke ekwesighi inwe ma o bu nadi acho inwe mmeko. Ha na di eche na ha ekwesighi icho ibu mma mmadu mana ihe a bughi ezi okwu. Ha choro ihe ndia di ka otu onye o bula siri cho ya.

O buru na amuru mmadu otu ahu ya na ezughi oke, ma o bu na ihe butere ya mere oge mmadi di obere, o nwere ike isiri onye ahu ike ikweta na nwoke kwesiri ihu ya, chookwanu ya. Mana isoro umu nwanyi di ka gi kpaa nkata, juta ha maka ihe na hugoro na onodu a na otu ha si merie ya ga enyere gi aka i gbanwe otu isi ahu onwegi. Cheta inwe ndidi. O ga ete obere aka igbanwe ihe ndi ikwetere banyere onwe gi.

Na aka ozo, o buru na ihe mere gi ka mere ohuru, i mara na onwere ike buru na i na ahubu onwe gi ka onye nwere ike inwe mmeko. Ugbua inwere ike imaghizi na ihea obu eziokwu.

O ga enyere umu nwanyi niile ndia aka ma o buru na ha ga enwe ike igu ma na enweta amamihe banyere mmeko bu udi nke umu nwanyi ahu dizuru mma na enweta. O ga enyere ha aka ma ha nwee ndi okachamalu ha ga esonwu nwee mkparita uka ma o kwanu umu nwanyi ndi ozo nwere disability.

Gi na onye nke gi gaa agbali ichoputa ihe na amasi unu abuo na mmeko. Na imatu, o buru na akpa gi aka na aka ma o bu ebe nwanyi gi adighi emetutazi gi n’ihi disability gi, unu kwesiri ichoputa ebe ozo o ga abu akpa gi aka, ometuta gi di ka nti, ara ma o bu onu. Udi a ga enyerekwa aka ma o buru na disabiliti emetutago mmeko eji ahu nwanyi enwe. Unu nwere ike ile ma pozition ma o bu otu ndi ozo aka aga aka mma, dika idila na akuku gi ma o bu inoro ala na mputa oche. O buru na gi na onye nke gi kpaa ezigbo nkata maka ihe a, unu ga enwenwu mmeko ga eju unu afo. Ikwesighi ka gi na onye i na achoghi nwe mmeko n’ihi disabiliti inwere.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011110