Gini bu PMS ma o bu ihe a na-akpo Pri Menstrual Sindrom na bekee

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_bu_PMS_ma_o_bu_ihe_a_na-akpo_Pri_Menstrual_Sindrom_na_bekee

Otutu umu nwanyi adighi anokwata otutu ubochi tutu ha ebido gbawa obara na onwa. Ha nwere ike inwe otu ihe ngosi ma o bu karia ihe ana akpo Pri Menstrual Sindrom (PMS). Umu nwanyi na enwe PMS nwere ike ihu:

  • Na ara ha di nro.
  • Afo ojuju na okpuru afo ha
  • Na ha enwewughi ike inyu nsi
  • Ajo ike ogwugwu
  • Obere ufu na akwara, okachasi nke mgbada azu ma o bu afo
  • Mgbanwe na udi mmiri na agba n’ahu nwanyi ha
  • Ihu igba mmanu na pimpu iputa n’ihu
  • Mmetuta (feelings) na agbanwe ososo, na kwa nke o na enweghi ike ime ihe o bula maka ya.

Otutu umu nwanyi na enwe opekatampe otu n’ime ihe ngosi a ga, ufodu ndi ozo na enwe ha ncha. Nwanyi nwere ike inwe otu n’ime otu onwa, nwee ndi ozo na onwa na eso ya. Nyere imirikiti umu nwanyi, nnukwu mmekpa ahu na eso ubochi ndi na abia tutu ha agbawa obara, mana nyere ndi ozo, ihe na agara ha nke ome nke oma.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010219