Gini bu afo osisa. Kedu ihe o ji di njo nwa m ibute ya

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_bu_afo_osisa._Kedu_ihe_o_ji_di_njo_nwa_m_ibute_ya

Afo osisa bu nje eritere n’onu ga ebute ya, nje si na si. A na ebutekari ya ebe a na ekpofughi nsi ofuma, ebe na adighi ocha, ebe mmiri onunu di ocha adighi ma o bu mgbe enyeghi nwatakiri ara.

Afo osisa na egbu umu aka site na imikpo mmiri na ahu ha nke na eme mmiri di nwa na ahu agaghi ezuzi. Umuaka nwere ike isi na ya nwuo karia ndi okenye n’ihi na mmiri na agwu ha na ahu ososo. Ozugbo afo osisa bidoro, o di oke mkpa inye nwa ahu ihe di mmiri, na kwa nri.

Nwata nwere Dayaria ma o buru na o nyuo nsi mmiri mmiri ihe kariri ugboro ato n’ubochi. Dayaria na akawanye njo, imara na ezigbo nsogbu di.

Onwere ndi na eche na inwu mmiri na eme afo osisa njo, ihe a abughi eziokwu. Ekwesiri idi na enye nwata nwere afo osisa ihe mmiri dika mmiri ara, ole obula inwere ike. Inwu nnukwu mmiri na enyere aka iweghachi mmiri afo osisa na anara mmadu.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020702