Gini ga eme ma m gaa nke ndi uwe ojii

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_ga_eme_ma_m_gaa_nke_ndi_uwe_ojii

Na ebe niile, iwakpo mmadu bu mpu, mana o nwere ike ite ezigbo aka biakwa sie ezigbo ike imeri ya n’ulo ikpe.

Gba mbo hu na mmadu so gi ga nke ndi uwe ojii.

Ha ga aju gi ihe mere. Oburu na ima onye ahu, gwa ha. O buru na imaghi, kowara ha otu onye ahu di. Inwere ike iso ha gaa icho onye ahu. E nwere ike igwa gi ka ‘legal Doctor’ ya na ndi uwe ojii na aru oru me gi nleta ozo. Nkea abughi nleta ka idi mma, o bu nleta ga egosi na ihea mere gi na ezia.

Na ufodu obodo, umu nwanyi esorola ndi uwe ojii ruo ihu na ha nwere umu nwanyi enyere nkuzi di iche ka ha nwe ike inyere ndi awakporo aka.

Ejide onye ahu, i ga aga gwa ha na o bu onye ahu na eziokwu. A ga eme ka iruputa onye ahu n’ihu ndi uwe ojii ma o kwa nu n’ihu Onyeikpe n’ulo ikpe ya. O ga n’ihu na Kot, i ga agbali chota onye Loya rugoro udi oru a na mbu. O ga agwa gi ihe che gi n’ihu banyere ikpe ahu. Agakwala soso gi, duru mmadu oge niile.

Iga ulo ikpe maka nwakpo ga esi ike. Iko ihe mere ugboro ugboro ga eme ka i cheta ihe ahu mere ozo. O bughi onye obula ga aju gi ya otu okwesiri, o nwere ndi ga asi na i na asi asi ma o bu kwuo ma o bu gi kpatara ya.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020316