Gini ga eme nwoke ga eji meruo nwanyi ahu

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_ga_eme_nwoke_ga_eji_meruo_nwanyi_ahu

Nwoke ga ekwu otutu ihe kpatara o ji eti nwanyi ihe; na o nwuru mmanya, na o jighi anya ya, na nke nwanyi kwesiri ya. Mana umu nwoke na eme umu nwanyi ihe a n’ihi ha kwere na o bu otua ka ha ga esi nweta ihe ha choro ma o bu ihe ha chere bu nke ha ka nwoke.

Nwoke o na adighi ka onwere ihe na aga na ndu ya, nwere ike iji ike choro onye ozo o kariri o ga eji ike na eyi egwu. O dighi mma iji ike arusa onye ozo, na emebi ndu ya.

Ihe ndia bu ihe mere umu nwoke ufodi ji akpa agwa a:

Ime ihe na ike na di emepe uzo

O na di enye ufodu nwoke ike iyija mmadu, nweta nwanyi no ya n’ihu ime ihe o choro ozugbo. Nwoke mere nkea agaghi enwe ike wetuo obi ala, chota aziza ihe bu nsogbu ya.

Nwoke nwere ike icho inwe udi ike iyija mmadu na enye ya oge obula.

Nwoke mee ihe n’ike, oge ufodu, o nweta ihe o choro. Onye o na eyija nwere ike inye ya ihe o choro ka o ghara imeru ya ahu. Udi ihe a na eme nke nwoke o di ya ka o ya mere ihe otu a gawa n’ihu. Ihe ike na mmekorita nwoke na nwanyi na eme mgbe otu onye nwere ike karia onye ozo

Akuzighi nwoke ihe o putara ibu nwoke nke oma

O buru na nwoke kwenyere na o kwesiri ibu ya ga ekwu ihe na eme na ndu nwanyi, o ga adi ya ka o nweghi ihe o mere iti ya bu nwanyi ihe. Otutu umu nwoke na agaghari ana akuzighi ihe o putara ibu ezigbo mmadu, ha ana agaghari na eche na ihe niile kwesiri idi otu naani ha choro ya. Na ezigbo nwanyi kwesiri idasa ha n’ukwu, na nwanyi ahu kwesiri imutara ya nwoke, na o bu so ha kwesiri ikwu ihe na eme na ezi na ulo ha, ihe ndia niile naani makana o bu nwoke. Ozo, Ihe ike na mmekorita nwoke na nwanyi na eme mgbe otu onye nwere ike karia onye ozo

Nwoke iche na nwanyi bu ihe o kwesiri inwe enwe.

O buru na nwanyi enwee ike onwe ya, nwoke nwere ike iche na nwanyi ahu ga agbarapu ya. Nwoke ahu aga n’ihu ime ihe niile o ga eji hu na nwanyi a enweghi ike nke aka ya.

Oburu na nwoke na ahu nwanyi ka propati, o ga adiri ya mfe ime ya ihe obula soro ya.

Nwoke amaghi otu ozo o ga esi di ma o bughi imemila nwanyi

O buru na nwoke huru nna ya ma o bu na o toro na gburugburu ebe ejighi nwanyi kporo ihe, na eti ha ihe, o ga eto buru udi mmadu ahu na amaghi otu ozo o ga adi.

Ihe niile ndia nwere ike ikowa ihe mere nwoke gi echi nwanyi ya onu n’ala ma o nyeghi ya ikike ime udi ihea ma ncha.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020105