Gini ka igba ogwu mgbochi ji di ezigbo mkpa

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_ka_igba_ogwu_mgbochi_ji_di_ezigbo_mkpa

Aro obula, umuaka otu nde na nari iri ano ie 1.4 million na anwuru oria ndi nwere ogwugwo site na igba ogwu mgbochi nke adighi acho acho.

Igba ogwu mgbochi na egbochi umu aka ibute udi oria diiri umu ntakiri njo. Umuaka niile kwesiri inweta ogwu mgbochi. A na eme ya site na itunye ya n’onu umuaka ma o bu igbanye ya n’ahu dika ogwu. Ihe o na aru bu ikuziri ahu nwatakiri otu o ga esi kpuchie onwe ya ma oria ahu bia n’odiniihu. O na aru oru naani oge enyere ha tupu mmadu aria oria ahu.

Nwata a na agbahi ogwu mgbochi ga ebute Measles, whooping cough na udi oria ndi ozo na egbu egbu. Umuaka riachaa oria nke a gbakee, ahu ha agaghi esi udi ike o kwesiri, ha agaghi etokwa ofuma. Ufodu n’ime ha ga enwe pemanent disability. Ha nwere ike inwu site na malnutrition ma o bu oria ndi ozo.

Umuaka agbara ogwu mgbochi bu ndi azoro ndu ha site na oria ndi gara igbu ha. Umuaka niile nwere ikike inweta igba ogwu a. Igba ya na oge di oke mkpa nya bu, ndi niile a gwara gi gbaa nwa na afo izizi ya na nke abuo kacha di mkpa. Umu nwanyi di ime kwesiri ilata ogwu mgbochi tetanus, iji debe ha na nwa ha ndu.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020704