Gini ka m kwesiri ikwado ma m ga ala

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_ka_m_kwesiri_ikwado_ma_m_ga_ala

Idi nkwadobe ila, i ga agbali kwado obi gi maka ihe ga esi obere ike tutu o di mma:

Nkwado gi

Oge na akara nwanyi njo bu o lachaa. Nwoke ahu enweghizi ike na ebe o no, o ga eme kwanu otutu ihe ikpoghachi ya azu. O nwere ike i bia igbu ka o si majaa ya. Nwanyi kwesiri igba mbo hu na o no ebe o naghi ahu ya. Ya agwakwala mmadu ebe ono. Nwoke nwere ihe itipu ya n’onu mmadu.

Ime ihe naani gi

I ga agbali ihu otu i ga esi na eme ihe niile naani gi, iji kwado gi na umu gi. O buru na i nwetara ebe unu ga anotu, jiri oge ahu muta ahia ma o bu lachie ulo akwukwo. O buru na i ga ahu ulo gi na nwanyi ozo no na udi onodu a ga ebi, unu ekee ugwo ulo ka o diri unu naabo mfe.

Mmetuta

Ihe niile ikwesiri ime iji bido ndu na isi nwere ike di gi ka o siri ike. O nwere ike itu gi egwu maka na imaghi otu esi ebi naani gi. I nwekara ike ihu na i na echeta onye nke gi ahu na agbanyeghi ihe o mere gi. O nwekwara ike i na elozo udi njo ihe di tutu igbalaga. Nye onwe gi efe iri uju maka ihe niile funara gi. Gbaa onwe gi ume. Hu ma i ga ahu umu nwanyi ndi ozo udi ihe a na eme ka unu nyere onwe unu aka.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020119