Gini ka m kwesiri ima maka mwakpo n’ike o bu onye ma amaghi mere

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_ka_m_kwesiri_ima_maka_mwakpo_n%E2%80%99ike_o_bu_onye_ma_amaghi_mere

O bu nkea ka otutu mamdu na eche maka ya ma ha nu na awakporo mmadu. Ebe mmadu doro mmadu n’uzo, dobanye ya ebe awakporo ya, ma o bu nwanyi noro na ulo ya, mmadu etibata ebe ahu, meruo ya ahu. Udi na atu oke egwu ma o dighi adikebe karia ndi ozo anyi kwugoro maka ya.

Nwakpo otutu mmadu

Ihe kariri otu onye nwere ike iwakpo mmadu. Otu onye nwere ike bido, ndi ojoo ibe ya abia soro ya. Ha na eme ihe a oge ufodu iji gosi onwe ha na ha bu ndi ike.

Nwakpo na ulo nga

Otutu umu nwanyi bu ndi ana awakpo na ulo nga ma o buru na ndi uwe ojii kporo ha ( mee ha arrest). Ozo bu na umu nwoke na awakpo onwe ha n’ime nga iji gosi onye ka ike.

Agha

Ndi soja na ndi na ebu agha na eji nwakpo eme wipon agha. Ha na awakpo umu nwanyi ndi ha na ebuso obodo agha n’ihu ezinaulo ha iji gosi obodo kariri ibe ya. Ha nwere ikpoga umu nwanyi na camp, were ha mere ngwa ahia, jiri ike mee tuba ha akwuna ma o bu sekshual slavery nke ha ga eji ana ha mmeko tutu ha ekwe ha rie nri ma o bu tutu ha hu nri ha ga enye umu ha. Eji kwa nwakpo ata mmadu ahuhu na agha.

OKWU DI MKPA: ndi lanarii nwakpo agha kwesiri inweta nleta puru iche. Ha nwere ike ime operashon maka mmebi ahu nwanyi ya. O buru na atubara ya ime, nya na nwa ya ga ata ahuhu irote na obu ndi iro mere ya ihe.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020306