Gini kam kwesiri ima banyere ida mba nya bu depreshon ma o bu enweghi muo ime ihe obula chaa chaa

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_kam_kwesiri_ima_banyere_ida_mba_nya_bu_depreshon_ma_o_bu_enweghi_muo_ime_ihe_obula_chaa_chaa

Otutu ndi mmadu na akpo ida mba bu depreshon obi inyi aro ma o bu mmadu enweghizi mmuo ma o bu mkpuru obi ime ihe obula.

Onweghi ihe o mere ma mmadu tufuo mmuo ya ma mmadu nwunari ya, mana o nwere ike ibu oria ma o buru na ihe ngosi ndia notee aka:

  • Mwute ma o bu uko ochi
  • Enweghi ike irahu ura ma o bu irahu ura gafere oke
  • Enweghi ike iche uche ebe odi mma
  • Mmadu achoghizi ime ihe ndi na ewetara ya ihunaya dika, iri nri ma o bu inwe mmeko
  • Nsogbu ahu di ka isi owuwa, nsogbu afo ana amaghi ihe butere ya
  • Okwu na ije na ado ado
  • Enweghi ike ime ihe ubochi gi
  • Iche echiche maka onwu na igbu onwe gi

Ida mba nke ojoo ya ga eduga mmadu na igbu onwe ya. Otutu mmadu na eche maka igbu onwe ya oge ufodu mana udi uche na abia oge niile ma o bu na abia siike, nwanyi ahu kwesiri ka achotara ya enyemaka ozugbo ozugbo.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011508