Gini mere umu nwanyi ji ka na anodu n’ulo a na eti ha ihe

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_mere_umu_nwanyi_ji_ka_na_anodu_n%E2%80%99ulo_a_na_eti_ha_ihe

Gini mere o ji ka nodu ebe ahu? Na abukari ihe izizi ndi mmadu na aju ma ha nu na ana di eti nwanyi ihe. Ha ka nku ihe nwere ike ime nwanyi o noro n’udi ebe ahu, ha bu:

  • Iyi egwu na imapu mmadu obi: nwoke ahu nwere igwa ya: ‘inwa anwa si ebe puo, egbuom ma gi, ma umu gi, ma ndi be gi’ nwanyi nwere ike inoro ga nwoke ghara iyisa ndi be ya ara.
  • Enweghi ego ma o bu ebe o ga aga: nke a na emekari ma o buru na o bu so nwoke na ekwu ihe eji ego eme na ulo, ma ego ya, ma ego nke nwanyi. Burukwa ezi okwu ma o buru na okwusiri nke nwanyi iga hu ndi be ha.
  • Enweghi mkpuchite: onwere ike, o nweghi ihe ga egbochili nke nwoke ichota ya ebe o gabpuru, meruo ya ezigbo ahu ma o bu gbuo ya.
  • Ihere: nwanyi nwere ike ibido chewe na o bu ya butere ihe na eme ya.
  • Ihe ndi uka ma o bu omenaala: nwanyi nwere ike ikwenye na o bu oru ya ihu na alum di na nwunye ahu kwusiri ike na agbanyehi ihe o na eri ya
  • Olilieanya na ihe ga agbanwe: o nwere ike idi nwanyi ka o huru nwoke na anya, na nwoke ahu ha aghota nkea ma kwusi iti ya ihe
  • Amamikpe onwe ya: iche na o na emegbu umaka ma o si na be nna ha, laa.

Mana ajuju ka mma bu, kini mere nwoke ahu agaghi ahapuru nwanyi na umuaka ulo, gaa choo ihe o ga eme onwe ya? Oburu na ajuo ihe mere nwanyi apughi, o na egwu na e chere na ihe niile bu nsogbu diiri nani nwanyi. O dighi mma iche otua.

O bu oru obodo niile gba gburugburu ihu na onye obuna bi n’ime obodo di mma.

O bu nwoke na eme mpu, na eme ihe ike megide ohere onye ozo nwere ibi n’obodo na enweghi nsogbu o bula. Obodo niile kwesiri ibia maa ya aka, kwusi ya bu nwoke.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020114