Gini mere umu nwanyi jiri kwesi nlebara anya di iche

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Gini_mere_umu_nwanyi_jiri_kwesi_nlebara_anya_di_iche

Oge ufodu oge mmadu di afo bido na iri ruo iri na ise, ahu nwata nwanyi na ebido ito na agbanwe. Oge a nwere ike ibu oge o na awotaghi nke oma. Nwata nwanyi nwere ike omaghi nke o bu abu, obere nwa nwanyi ka o agbogho nwanyi. Ahu ya di n’etiti ha abuo na eme ihe o na ahunu beghi na mbu. Ihe o ga eji sie ike bu na o buru na onweghi onye obula o ga agwa ihe na eme ya ma nata ndumodu maka ihe ndi na abia na odiniihu.

Otu n’ime ihe di oke mkpa nwanyi ga emenwu bu iri ezigbo nri ma debe onwe ya na ahuike. Ahu ya kwesiri inwe protin, vitamin na mineral n’oge a. Nwata nwanyi kwesiri idi na eri nri otu nwata ndi nwoke si eri. Iriju afo ga egbochinwu oria, mekwaa ka o na eme ofuma na ulo akwukwo, na enye idi ime gbasirike, amumunwa nakwa nka na enyeghi nsogbu obula.

Umu nwanyi kwesiri iri ezigbo nri maka mgbe o bidoro huwa nso ya, o ga na agba obara kwa onwa. Na igbochi anemia bu obara na esighi ike, o ga acho iwechi obara ahu site na iri nri nwere Ayon na ya. Ozo kwa, umunwanyi kwesiri iri nri juru na Kalshiom nke ga edebe okpukpu ya ike.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020802