Kedu ihe m ga emema o buru na awakporom

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ihe_m_ga_emema_o_buru_na_awakporom

O buru na nwanyi nwere ike igbanahu onye biara ya ogu, o nwere ike igbanahu nwakpo ahu oburugodu na onye ahu ji wipon. Otu obula ogbaliri ihu na ihe a emeghi ya, otu ahu ka o jiri nwee ike igbanahu ma imeru ahu ma nsogbu mental helt nwakpo na ebu abia.

Mmadu agaghi ama otu o ga esi eme ma udi ihea biara ya. Ufodu umu nwanyi ga eji iwe choo izo onwe ha ebe egwu ga ejide ndi ozo. Mara na o buru na udi ihea mere gi, na i ga eme ihe niile inwere ike ya.

Ihe ndi a nwere ike inyere gi aka ma a na awakpo gi:

  • Ebela akwa, ario na aririo, ma o bu kwenye. Ihe ndia adighi enyere aka kama umu nwanyi mere ha na ahuju anwa karia.
  • Uche gi di ya, anya di ebe o no. O nwere ike inwe oge o na adighi ele gi anya.
  • Gbalia mee ihe di iche iche. Tie mkpu, gba ya ukwu, ihe o bula inwere ike ime iji gosi ya na ibughi onye a ga eme ihea na mfe, na ibu mmadu, ibughi osisi.
  • O buru onye ima, gwa ya otu ihe o na eme si emetuta gi. Ekwela ya chee na umu nwanyi na acho ihea. Mee ka oghota ihe o na eme.
  • O buru onye i maghi, gbalia ihu ihe o di ka ya, o buru ibu, o nwere apa na ahu, o sere ihe osise na ahu, kedu udi akwa o yi. Gbalie irote ihe niile i nwere ike. O ga enyere ndi uwe ojii aka igwa umu nwanyi ndi ozo maka onye ahu.
  • O buru na ha kariri otu onye ma o bu o buru na otu onye ahu ji mma ma o bu egbe, onwere ike igaghi anusara ya ogu.
  • Jiri uche lee ihe inwere ike ime. Naani gi mara ihe inwere ike ya n’ihi na o buru na agha, nke nwoke enweghi ihe o ga eji hapu gi ndu ma inye ya nsogbu obula.
Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020312