Kedu ihe m kwesiri ima banyere ukwara oyi and oria ndi ozo ekwesiri ikpachapuru ezigbo anya

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ihe_m_kwesiri_ima_banyere_ukwara_oyi_and_oria_ndi_ozo_ekwesiri_ikpachapuru_ezigbo_anya

Ukwara, oyi, akpiri mgbu na nkpo imi bu ihe ama ama na ndu umu aka. Obughi ihe itu ujo. Mana oge ufodu, ukwara na abu ihe ngosi oria ojoo ndi ozo dika nimonia ma o bu ukwara nta. Obere nwa na enweghi ike iku ume ma o bu na eku ume oso oso nwere ike inwe nimonia, nke bu infekshon gbasara akpa ume (lungs). Ihe a abughi oria eji egwu egwu cha cha. Nwatakiri a kwesiri ka a kpoje ya oso oso na ulo ogwu ka okachamalu hu ya anya.

Nimonia bu ihe na egbukari umuaka na emebeghi afo ise na mba uwa niile gbaa gburu gburu. Nke na esochiya anya bu afo osisa. Nimonia na egbu umuaka nde abuo kwa afo. O na egbu umuaka karia iba, AIDs na Mizuls etikoro onu. Otu n’ime ihe ise na egbu umuaka na erubeghi afo ise bu nimonia. Ojoka.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011602