Kedu ihe m kwesiri ima gbasara oge nso m ji abia na onwa obula

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ihe_m_kwesiri_ima_gbasara_oge_nso_m_ji_abia_na_onwa_obula

Otu ugboro na onwa mgbe nwanyi no na afo imu nwa, umu nwanyi na enwe otutu ubochi ha na agba obara. O bara ahu na esi na akpa nwa, garuo na ebe osiri buru nwanyi wee puo na ahu ya. A na akpo ihea na oyibo, ‘monthly bleeding’ ma o bu ‘monthly period’. Ihe a di mkpa, burukwa ihe nwanyi ahu di mma kwesiri ihu. O so n’uzo ahu nwanyi si akwado idi ime.

I juo otutu umu nwanyi, ihe a bu ihe magoro ha ahu mana otutu oge, ha amaghi ihe na eweta ihe a ma o bu ihe kpatara o ji agbanwe oge ufodu.

Otu ihe a si aga na adi iche n’iche. O na ebido na ubochi nke mbu nwanyi huru obara. Ha ka nku bu umu nwanyi na agba obara ma onwa guo ubochi iri abuo na asato mana nyere ndi ozo, nke ha na abia ubochi iri abuo obula ma o bukwanu ubochi iri ano na ise obula. Ufodu nwanyi nwere ike ihu na mkpuru ubochi a na agbanwe ma o buru na o nwee nrugide(stress) na onwa gara aga, ma o bu o na-akatu nka, ma o bu omuchaa nwa.

Udiri ihe oyibo na akpo homone, nke progesterone na estrogen, nke na aputa na ahu nwanyi kwa onwa, na agbanwe agbanwe. Na mbido oge igba obara, ime ahu nwanyi na emeputa estrogen nke na eme ka obara na tishu too n’ime akpa nwa. Ahu nwanyi na emeputa nkea nke ga eme ka nwa nwee ebe di nro o ga eto ma nwanyi di ime na onwa ahu.

Oru o ubochi iri na ano na ebido oge igba obara, mgbe ebe ahu akowagoro di njikere, akwa ga esi na ovri puta. A na akpo nkea Ovulation. Akwa a ga ebili njem igawa na akpa nwa, oge di otua, nwanyi were nnukwu ike idi ime. O buru na ohuru nwoke n’oge a, o ga atuta ime.

Oru o ubochi iri na ano na emechi oge igba obara, site na ubochi a, ruo mgbe igba obara ya bidoro na onwa nke ozo, ahu nwanyi na emeputa progesterone, Ndia na eme ka akuku akpa nwa kwadowe maka idita ime. Na onwa ufodu, akwa ahu ama enwete ihe okwesiri iji gholu nwa. Ka nkea na emeghi, ime ahu nwanyi akwusi imeputa estrogen na nwanne ya progesterone. Nke a kpatara akuku ahu ahu ebido gbari be ka obara umu nwanyi na ahu. Otu a ka oge igba obara ozo ga ebido. Igba obara gachaa, ndi ovri ebidokwa na isi meputawakwa estrogen. Usoro a ebido kwa ozo.


Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010215