Kedu ihe m kwesiri iri mam na enye nwa ara

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ihe_m_kwesiri_iri_mam_na_enye_nwa_ara

Ndi nne kwesiri iri ezigbo nri, iji nweta onwe ha ma ha muchaa nwa, iji leta nwa ha anya na kwa maka oru niile ha na aru. O ga adi mma nke ukwuu ma o buru na ha na eri nri juru na protin na mkpuru osisi na akwukwo nri. Ha kwesiri inwu oke mmiri, miyulku na ihe onunu ndi ozo na adi ahu mma maka ahuike ha. Mana na agbanyehi ihe nwanyi riri, ahu ya ga emeputa mmiri ara.

Rijuo afo onu. Ghara mmanya na aba n’isi na ndi otu ya. Mmiri di ocha, mkpuru osisi, mmiri si na akwukwo nri ka kofi na umu mmanya ndi ozo na eme shii shii ma emepe ya, oyibo kporo soda.

Oburu na nwanyi erighi nri zuruoke, o nwere ike inwe obara na agbasighi ike ana akpo anemia na kwa oria ndi ozo.

Oge ufodu a na enye umu nwanyi otutu nri n’ihi na ha na enya nwa ara, nke a bu ihe di mma sooso ma o buru na nri ndi ahu juru na ihe ahu choro. Ezigbo nri na enyere ahu nwanyi ilachite na ahuike ma amuchaa nwa.

Nwanyi nwere ike iri nri karia ma o buru:

  • Na o na enye umu aka abuo ara
  • Na o na enye nwa ara ma dikwa ime ozo
  • Na enweghi ihe di ka afo abuo n’etiti umu ya
  • Na ahu adighi ya ma o bu na o na enwe ike ogwugwu.
Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010805