Kedu ihe m nwere ike ime maka nzoputa onwem mgbe mchoro ila

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ihe_m_nwere_ike_ime_maka_nzoputa_onwem_mgbe_mchoro_ila

Debe ego otu obula inwere ike. Tinye ya otu ebe na abughi ulo unu ma o bu mepe akaunt na ulo aku na aha gi, ka i wee kwadowe maka isi ebe ahu puo. Okwegi omume, chee maka ihe ndi ozo inwere ike ime iji hu na obughi ya ka i na agakwuru maka ihe niile i choro na uwa. Nwee ndi enyi, hu ndi be unu, choo ezigbo otu i ga abanye, udiri ihe ndia.

I nwere aka oru i ga eji nweta obere ego n’akuku?

Lee anya ma enwere ulo emepere umu nwanyi no n’udi onodu a. Ufodu obodo nwere udi ebe ahu ebe udi nwanyi a na umu ya ga anoru obere oge. Choputa nke a tutu igbalaga.

Juo ndi enyi ma o bu umu nne gi ka ha kwe gi noro na nke ha ma o bu nyetu gi ego. Gba mbo hu na agaghi agwa onye obula na i nara ha ihe.

Hu na iji akukwo gi di mkpa dika, ID card, akwukwo a na enye ma agbachaa ogwu mgbochi na ndi ozo. Were otu oyiri nye onye inwere ntukwasi obi na ya. Debe ego na akwukwo ndia na kwa ufodu akwa na aka onye ahu maka o buru na i nweta ohere gbalaga.

O buru na i ga emenwu ya, gi na umu gi mee omumu ihe ndi niile ihu ma o ga aga ofuma. Gba mbo hu na umuaka agwaghi onye o bula.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020118