Kedu ihe nwere ike ikpata mgbanwe n’ usoro igba obara

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ihe_nwere_ike_ikpata_mgbanwe_n%E2%80%99_usoro_igba_obara

O nweghi ihe o mere ma igba obara gbanwee n’oge ufodu. Ihe ndi nwere ike ikpata ya bu oria, nrugide (stress), afo ime, inye ara, ogologo njem na igbanwe ihe oriri. Mana o buru na mgbanwe a mee na mberede, noro karia uzo onwa one mo one, ma o bu oburu nsogbu ndi ozo ga, onwekwara ike ibu ihe ngosi na ezigbo nsogbu di.

Oburu na igba obara bia gbanwee, gbaa mbo tulee, mara na onwere ike ibu afo ime, mee nkea oburugodi na i na eme nhazi ezi na ulo a na akpo famili plannin.

Mgbe ufodu, ebe a na akpo ovri enweghi Akwa o meputara. Mgbe nke a mere, ahu nwanyi na emeputa so obere progesterone, nkea na ebute ngbanwe na otu ole nakwa obara ole nwanyi ga ahu. Umu nwanyi igba obara ha ka bidoro ebido na ndi ka kwusiri inye ara akwusi nwere ike ihu igba obara mgbe obula o biara. Ha nwekwara ike ihu obere obara ma o bu obara buru ibu. N’oge ya, ihe ndia ga emezi onwe ha.

Umu nwanyi na etinye ihe nhazi ezi na ulo akporo famili planin nke homone na di enwe blidin na etiti onwa.

Umu nwanyi ndi katagoro ahu ma na erubeghi menopos nwere ike igba oke obara karia ka ha si agba oge ha pere mpe. Ha ruwe menopos, igba obara ha nwere ike ibiawa oge obula o choro.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010217