Kedu ka ahum si agbanwe na pubati

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_ahum_si_agbanwe_na_pubati

Umu nwanyi niile na enwe mgbanwe na pubati mana ha na adi iche iche nyere onye obula. Nya bu, ya adina gi ka o nwere ihe di njo ma o buru na ahu gi adighi ka nke onye ozo.

Otito

Nke izizi i ga ahu nwere ike ibu na i na eto ngwa ngwa. I nwere ike ika umu nwoke niile gi na ha no otu afo ogologo. I ga akwusi ito n’ime otu afo ma o bu ato nso go bidoro.

Ahu Ngbanwe

Nwanne ito ogologo ngwa ngwa i ga ahu bu ahu gi ga ebodo ngbanwe. Enwegasiri kemikal di na ahu ana akpo Homone ga agwa ahu gi ha tokwuo ma mee ka ihe ndia puta ihe:

  • Ahu gi ebido diwa ka nke nwanyi
  • Pimple aputawa gi n’ihu
  • Ahu gi ga na eweputa heat ma o bu osiso
  • Ntutu epuwe na abu gi, na ahu nwanyi gi
  • Ara gi etowe, bido imeputa milk. Ha na ebuwanye ibu, onu ya nwere ike bido fuwa ufu. Otu nwere ike ibido towe tutu nke ozo mana nke obere ga emesia chukwude nke ozo.
  • Ihe di ka mmiri ga ebido putawa na ahu nwanyi gi
  • Nso gi ebido kwa onwa

N’ime ahu gi

Onwere udi ngbanwe i naghi ejiri anya gi hu. Akpa nwa, tube, akwa, ahu nwanyi, ha niile ebido to we na agbanwe ebe ha nobu.

Ka ahu si eme gi

Ka ihe niile na aga, i ga ebido huwa onwe gi otu di iche. Inwere ike bido hutawa umu nwoke, nwebe enyi. O ga enwe oge o naghi ekwe gi ejikota onu, otu ahu si eme gi. Tutu nso gi abia n’onwa, o nwere ike idi ahu gi ka ihe ozo, o na adi gi akwa, o na adi gi amu, na agbokwojugi anya - udi ihe ahu.

Nso gi n’onwa n’onwa

Obara ahu na aputa bu ihe ngosi na iga atuta ime. Onweghi nwata nwanyi maranu oge nke izizi ya ga abia. O na eme ma o buru na ara ya puta, na kwa ntutu si ya ahu na aputacha. Otutu onwa tutu nke izizi a abia, o nwere ike ihu na ebe ahu di obere mmiri. O nweghi ihe na emebi ma ncha.

Ufodu umu nwanyi na enwe anuri oge ha huru nso ha nke izizi, okacha ma o buru na ha ma ihe na abia. Umu nwanyi a na agwaghi maka ya na di atu egwu ma obido. O bu ihe na eme nwanyi niile n’uwa gbaa gburu gburu. Ya enwela onye obula mere gi ka o dika ikwesiri izo iha ezo ma o bu nwee ihere maka ya.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020803