Kedu ka ga esi agbanahu nsogbu anu ahu

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_ga_esi_agbanahu_nsogbu_anu_ahu

Gbaa mbo hu na i na emeghari ahu opekatampe awa abuo o bula. O buru na i na edina ala oge obula, hu na mmanu nyere gi aka idina otu ozo.

Noro ma o bu dina ala na ebe di nro, na abughi ebe siri ajo ike. Itinye akwa ma o bu ihe di nro ka pilo ga enyere aka. I nwekwara ike ime ebe nnoro ala ma o bu ndina ala site na igboju akpa plastic beans ma o rice a na esighi esi. I ga ekpofu ihe ndia tinye nke ohuru onwa o bula.

Lebara ahu gi anya ubochi obula. Were inyo lee ebe niile anya. Ihu ebe di ka onwere ihe mere ya, kpachapuru ebe ahu anya ruo oge anu ahu ebe ahu nachitere onwe ya. ka o ghara ighoro onya

Hu na i na eri nnukwu mkpuru osisi, akwukwo nri na nri juru na protin.

Na oge nso gi, ejila ihe a na akpo tampon n’ihi na o ga apido na okpukpu di n’ime ahu gi ebe ahu, nwere ike meruo gi ahu n’ime ebe ahu.

Na awu ahu gi kwa ubochi. Jiri akwa ma o bu towelu hichaa ahu gi ma iwuchaa ahu ma ahi na ya ahi na ahu gi, na edesa ya edesa (pat dry) ka ohara imeru gi ahu. Etela mmanu ahu n’ihi na o ga eme anu ahu gi odee ede. Etekwala mmanya na aba n’anya na ahu gi maka ihe obula.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011107