Kedu ka m ga-esi nwe ahuike mgbe m di ime

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga-esi_nwe_ahuike_mgbe_m_di_ime

Ilekota onwe gi nke oma oge idi ime ga enyere gi aka inwe afo ime na imu nwa di mma nakwa imuta nwa ahu di.

Gbaa mbo hu na i na eri nri akporo balanced diet. Ezigbo nri na enye ike, na egbochi oria, na enye nwa ahu di mma ma na enyere aka ikwusi oke igba obara na imu nwa. Cheta na ina eri nke gi, mmadu ozo esiri ebe ahu na eri nke ya. Riwe nnu nwere ayodin (iodine) na oge a ka nwa gi gbanahu nsogbu mental slowness( ka uche nwa gi zuo oke).

Na araru ura, ma na enwe ezumuike. O buru na ana akwu oto aru oru gi, gbalia ino ala ma o bu idina ala otutu oge n’ubochi. Ruo oru ubochi gi ma gbaa mbo hu na i na enweta ezumike oge obula.

Iga aga nleta ndi di ime (pri natalu), ka a hu ma o nwere ihe bu nsogbu. O buru na e nwere nsogbu, ka ahu ya n’oge tutu o ghoro ihe ozo. O buru na agbabeghi gi ogwu nje tetanus, hu na igbara ya osiso osiso. Hu na agbara gi ya opekatampe, ugboro abuo ugbua idi ime.

Guo maka ihe gbata gbata na eso idi ime ka imuta mkpa o di ihu onye ahuike.

Na edebe onwe gi ocha n’ oge a. Wuo ahu ma saa eze gi kwa ubochi.

Na agbali ime eksesaiz ana akpo skweezin eksesaiz. Nke a bu ka ahu nwanyi gi ka gbasie ike ma imucha nwa.

Gba nbo na enweta eksesaiz kwa mbochi. O buru na oru gi nwere nnukwu inoro ala, hu na i na agatu obere ije ma lee anya ka i ghara imefeya oke.

Nata ogwugwo ma o di gi ka inwere nje a na ebute na mmeko nwoke na nwanyi na ndi ozo ga.

Ga ka enyocha gi ahu maka HIV. Gbanahu HIV ka idi ime site na iji okpu nna bu enyi oge obula ichoro inwe mmeko.

Gbanahu inu ogwu osisi ma o bu ogwu obula o na abughi onye okachamalu ahuike mara na idi ime nyere gi.

Anwula mmanya ma o bu see ihe osise oge idi ime. Umu ihe ndia adighi mma nye nne na nwa o bu na afo.

Enwee anwu nta ebe ibi, gbaa mbo hu na i na ehi n’ime ulo mgbochi anwunta (mosquito net) ka ha ghara itanye gi iba.

Gbanahu kemikalu obula. Ha nwere ike imeru nwa ibu na afo ahu. Emetula ha aka, ano na ha nso, ekula ume ebe ha di, etinye na nri ma o bu mmiri na iko ejibu gbanye ha mbu.

Gbanahu nwa obula nwere ihe tuporo ya na ahu di ka oria. O nwere ike ibu ihe akporo Jaman mizul (German measles) na adighiri nwa ibu na afo mma.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010705