Kedu ka m ga eji gwanwu nne na nna m okwu

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_eji_gwanwu_nne_na_nna_m_okwu

Iso nne na nna kpa nkata adighi adi mfe. Ha nwere ike icho ka i biri otu ha choro ma i choghi ya otu ahu maka na odi gi na uwa ana eme ntughari. O nwere ike idi gi ka ha adighi ege gi nti ma o choo ighota ma o kwanu di gi ka ha aga ewesara gi iwe.

Ndi be unu nwere ike ihu gi na anya ma ha akwadoghi ihe niile i na eme. He nwere ike iwe iwe n’ihi na ha choro ka o diri gi na mma, obughi maka na ha choro ime gi ihe ojoo. Gbalie, kwanyere ha ugwu, ma jiru nwanyo kowaara ha ihe i choro ka ha ghota maka gi.

I nwere ike ihu ma ihe ndia aga aru oru:

  • Rolu oge di mma. Nabughi oge ha ji ihe na aka, ike kwuru ha, ma o bu oge ha na eche echiche banyere ihe ozo.
  • Gwa ha ihe niile na echu gi ura, juo ha ihe ha ga eme ma ha buru gi
  • Nye ha ihe guo, ma o bu gosi ha ihe banyere nsogbu i na enwe
  • Ihe kpasue gi iwe, ejela tiwe mkpu. I ga akpasu ha iwe. Ime nkea, ha ga echee na inaghi enye ha nsopuru
  • I nwalee ihe ndia, na enweghi ike igwa ha okwu, gbalia choro onye ozo i nwere ike igwa ihe na aga na ndu gi. O nwere ike iburu onye nkuzi, nwanne nne ma o bu nna gi, mama nnukwu gi, mmadu na ebe i na aga uka ma o bu onye okachamalu ahuike.


Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020820