Kedu ka m ga esi ekpuchite anya m

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_ekpuchite_anya_m

Ahuhu na ebu nje. Ihu na adighi ocha na akpo ahuhu oku, ahuhu bia zaa oku a, o fesaa nje ebe ahu niile. Iji ncha and mmiri di ocha saa ihu na aka kwa ubochi na enyere aka igbochi infekshon na emetuta anya. N’ufodu mba uwa, oria ma o bu infekshun anya na ebute oria a na- akpo trakoma nke na emesia bute ikpu isi. Infekshun bara n’ime anya mmadu na ebute onye ahu ina adighi ahu uzo nke oma, mgbe ufodu o na anarakwa onye ahu ahumuzo ya. Nke a ka o ji di ezi mkpa na anya bu ihe elebara anya nke oma.

O buru na ahu di anya mmadu mma, i ga ahu na onweghi ihe dichiri ebe ahu nadi acha ocha. Anya ahu ga adi obere mmiri, ejiri kwa ya na ahu uzo na enweghi nsogbu obula. O buru na anya mmadu na acha obara obara ma o bu o buru na o koro ako nke ukwu, ma o bu oburu na ihe na -esi na ya puta, ma o bu o buru na mmadu adighi ahuzi uzo otu osiri ahubu na mbu, onye ahu kwesiri iga osiso osiso na ulo ogwu ka onye okachamalu lelee ya anya.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010116