Kedu ka m ga esi ekpuchite anya m
Ahuhu na ebu nje. Ihu na adighi ocha na akpo ahuhu oku, ahuhu bia zaa oku a, o fesaa nje ebe ahu niile. Iji ncha and mmiri di ocha saa ihu na aka kwa ubochi na enyere aka igbochi infekshon na emetuta anya. N’ufodu mba uwa, oria ma o bu infekshun anya na ebute oria a na- akpo trakoma nke na emesia bute ikpu isi. Infekshun bara n’ime anya mmadu na ebute onye ahu ina adighi ahu uzo nke oma, mgbe ufodu o na anarakwa onye ahu ahumuzo ya. Nke a ka o ji di ezi mkpa na anya bu ihe elebara anya nke oma.
O buru na ahu di anya mmadu mma, i ga ahu na onweghi ihe dichiri ebe ahu nadi acha ocha. Anya ahu ga adi obere mmiri, ejiri kwa ya na ahu uzo na enweghi nsogbu obula. O buru na anya mmadu na acha obara obara ma o bu o buru na o koro ako nke ukwu, ma o bu oburu na ihe na -esi na ya puta, ma o bu o buru na mmadu adighi ahuzi uzo otu osiri ahubu na mbu, onye ahu kwesiri iga osiso osiso na ulo ogwu ka onye okachamalu lelee ya anya.