Kedu ka m ga esi eleta eze m anya

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_eleta_eze_m_anya

Ileta eze mmadu anya di mkpa n’ihi na:

  • Eze ahu di, nke kwesiri ike di mkpa iji taa nri nke oma.
  • Eze imebi emebi, na kwa nke oyere jugoru nke na afu ajo ufu bu ufodu ihe ileta eze anya ga egbochi.
  • Eze retoro ereto nwere ike iburu ajo infekshun site na eze, bugaa ya n’akuku ahu ndi ozo.
  • Ndi na ahapu eze ha, na anaghi eleta ya anya bu udi ndi ga aka nka ghara inwe eze obula foduru.

Ekwesiri ihicha eze ugboro abuo kwa ubochi. Nke a ga ewepu nje na ebute eze mgbu, eze mmebi na eze idapu. Hichaa ihu na azu eze, ibia hichaa n’etiti eze na okpuru ukwu eze. Were atu na akataghi ahu ma o bu mkpisi atu were mee nkea. Tutupest (toothpaste) di mma mana inwere ike ita atu ma inweghi ya. I ga ejinwu nnu, bakin soda, ma o bu naani mmiri di ocha.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010115