Kedu ka m ga esi gbanahu afo osisa

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_gbanahu_afo_osisa

Umuaka na okenya ga elo nje na ebute afo osisa ma o buru na nsi banyere na mmiri onunu, nri, aka, ihe eji esi nri ma o bu ebe a na esi nri.

Lee ihe i ga eme iji kwusi nfesa afo osisa:

  • Jiri ncha na mmiri ma o bu ntu na mmiri ma inweghi ncha kwuo aka gi oge obula igasiri mposi, metu ya aka, tupu imetu nri aka, tupu irie nri ma o tupu inye nwa nri.
  • Umuaka na etinye aka n’onu oge obula. Nya bu, o ga adi ezigbo mkpa idebe ulo ocha ma kuziere umu aka ikwo aka ha nke ome nke oma na oge niile okachasi ma ha gachaa mposi na tupu ha erie nri
  • Kpofuo nsi umuaka niile n’ime latrine ma o bu lie ya n’ala. Were ditolu hichaa ebe niile.
  • Nwuo naani mmiri di ocha
  • Jiri mmiri di ocha saa, bechaa, ma sie nri niile okachasi ma umuaka eso eri nri ahu. Nri arapuru oye ga anabata nje ga ebutenwu afo osisa. O karia awa abuo, nri esiri esi adighizi mma oriri beluso ma esikwara ya n’oku ma o bu tinye ya na fridge. Lie ma o bu suo dustbin oku ka ijiji ghara ibusasi nje
  • Nye nwa naani ara na onwa isii amuchara ya. Iga n’ihu na enye ya ara ga enyere aka iwetu ihe gara ime ya obute afo osisa.
  • Ogwu mgbochi rotavirus na ewetu onwu anadi anwu n’ihi nje a. Hu na agwara gi gbaa ya tupu igbaa ya nwa gi.
  • Vitamin A na ogwu Zinc ga ewetu ihe ga eme mmadu ebute oria. Nri juru na ha bu, mmiri ara, liver, azu, milk na ihe eji milk me, oroma, mkpuru osisi na akwukwo nri. Idina anwu ogwu zinc(mkpuru ubochi iri ruo mkpuru unochi iri na ano) iji gwo afo osisa na enye aka iwetulata udi njo odi na ohe o ga ewe ile. O na enyere aka igbochi afo osisa na odiniihu ruo onwa nabo.
Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020703