Kedu ka m ga esi gbanahu akwara koro eko

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_gbanahu_akwara_koro_eko

Akwara ichaghari achaghari n’ukwu nakwa n’akuku ahu nwayi bu ihe oyibo na akpo varikoz veins. Ihe na akpata ya bu nwa ebu na afo na eto, na ebuwanye ibu. Ha nwere ike iza iza na afukwa ufu. Lee ihe i ga eme igbanahu ya:

  • Gbalia hu na inaghi akwu oke oto. I na akwugodi oto, na agaghari otu ebe ma na eweghari aka na ukwu gi. I noro ala, nadi eweli ukwu gi elu.
  • Gbaa mbo hu na i na aga ije ubochi obula. O buru na onye ahu dara ngworo ma o bu ihe mere na o gaghi aga ije, ndi be ya nwere ike inyere ya aka iweghari ukwu na aka ya.
  • O buru na ihe nkea mere nnukwu, were akwa ma o bu bandage kpuchie ukwu gi site na mgbada ukwu rue na ikpele. O ruo na abali, i topu ya.
Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010710