Kedu ka m ga esi gbanahu mmeko m na achoghi inwe

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_gbanahu_mmeko_m_na_achoghi_inwe

O buru na nwoke choro inwe mmeko ma i choghi, kelee ya ma si ya na ichoghi. Egwu na atu so gi ino ebe o no, kporo onye ozo ga ma o bu ziga onye ozo ka o ga gwa ya okwu.

Kwusie mba ike mgbe o na ana gi ya. Si ya mba oge obula o juru gi. Were onu gi mba, were ahu gi si mba, ka o ghara idi ka iji onu ekwu otu ihe, were ahu ekwu ihe ozo.

Si ebe ahu puo ma mmadu kpatu gi aka otu i na achoghi. Ahu gi na agwa gi na ochoghi ya, nyabu tie oke mkpu, ma si ebe ahu puo.

Anwuna mmanya na aba n’anya ma o bu see ihe osise. Ihe ndi a na anara gi uche, mee ka ighara ima ihe na eme gi.

Ina apu apu, hu na ndi mmadu so unu. O ga ahia aru ime gi ihe obula ma ndi ozo noro ebe ahu.

Ga so na ebe mmadu ga ahu gi.

Bido na mbu gbakoo, kpebie udi mkpatu aka ichoro na nke ichoghi. Uche gi di ya oge niile ka i were mara ihe na eme na ihe ikwesiri ikwusi

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020815