Kedu ka m ga esi gbanahu mwakpo n’ike

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_gbanahu_mwakpo_n%E2%80%99ike

Onweghi otu uzo ma obu uzo ozo esi agbara ihe nke a oso, mana o nwere udi ihe nwanyi ga eme, ga enwe ike inyere aka igbanahu ufodu nwakpo. Ihe ndi o nwere ike ime dabere na o ma nwoke ahu ka o maghi ya, egwu o na atu ya na kwa udi nsogbu odi ya ka o no n’ime ya ebe ahu. Chetakwana na nwoke wakpoo nwanyi, o bughi maka na nwanyi agbanahu ya, o bu maka na nwoke mara na oka ya ike, nwere ike ahu wakpo ya.

Udi ihe nwere ike inyere aka:

  • Hu na o bu gi na umu nwanyi na aru oru. O ga aka mma ma unu rie nne karia naani otu onye
  • Ekwela onye obula i na amachaghi bata n’ulo gi. Ekwela ya mata na o bu so gi no ebe ahu.
  • Hu na obughi naani gi na aga ije na abali. I ga aga naani gi, na aga ga onye obi kara, ufodu ndi ojoo na elepuru anya umu nwayi di ka egwu o na atu ha.
  • O di gi na mmadu a na esoghari gi, gaa uzo ozo ma o bu gakwuru onye ozo ma o bu ulo ma o bu ebe a na ere ihe ma o bu laghachi azu were oke olu juo onye ahu ihe o choro
  • Jiri ihe ga eme nnukwu nkpotu di ka pipilo. Ozo, jide ihe i ga eji chekwaa onye gi. Nke a nwere ike bu osisi, ihe i ga agba ya na anya ma o bu ose i ga afunye onye ahu na anya. .
  • Mmadu biakwute gi n’ike, tie oke mkpu ma o bu fuo pipilo gi. Nke a arughi oru, hu ma iga etighachi ya ihe ma o bu taa ya ahu, ihe o bula i ga emenwu iji gbalaga.
Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020307