Kedu ka m ga esi gbanahu nsogbu nwakpo

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_gbanahu_nsogbu_nwakpo

  • Esola onye obula i na amaghi nke oma gaa ebe obula
  • Nwee otu i ga esi laruo ulo gi ma i choo ina. Ka o ghara ibu soso onye ahu nwere ike ikpolaga gi
  • Gwa onye ahu na i choghi udi okwu ahu ma o bu na ichoghi udi mmetu aka ahu. O buru na okwusighi, si ebe ahu puwa oso oso.

O buru na onye ahu bu onye isi gi na ofis ma o bu na ulo oru:

  • Oge mbu o mere udi ihea, gwa ya kwusia. O buru na o na eme ya n’ihi okwa onwere, o ga na acho onye ozo o ga eyinwu egwu. Mee ka o mara na egwu adighi atu gi. O ga enwe ike ikwusi ma o buru na i ga eme ya o hapu gi aka tutu ome ihe ozo o choro.
  • Soro umu nwanyi ndi ozo kpaa nkata maka ya. Inwere ike ihu na o bughi so gi ka o na enye nsogbu. O buru na i ga agani’ihu na mmekorita gi na ya, hu na gi na mmadu so ga ma o nwe ihe o nara gi. Gwa umu nwaniy ndi ozo ka uche ha di ya. Mara na oburu na nwoke egosighi nwanyi nkari site na iwakpo ya, o nwere ike icho uzo ozo.
Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020309