Kedu ka m ga esi gbanahu nsogbu oria

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_gbanahu_nsogbu_oria

Imirikiti nsogbu ahuike bu ndi enwere ike igbochi tupu ha ebido site na iri ezigbo nri, idi ocha, izu ike na inye umu nwanyi ihe ahuike ha choro. Obodo ahu di mma na enyere ahuike umu nwanyi aka. Umu nwanyi ahu di mma na eleta ezi na ulo ha anya. Ezi na ulo ahu di mma na esonye na ihe na emepe obodo.

O dighi adi mfe umu nwanyi igbochi oria. Obunadi na ha na eme otutu ihe idebe ezi na ulo na obodo ha na ezi ahuike, otutu umu nwanyi adighi enwe ike ma o bu oge ma o bu ego ha ga eji gee nti na ihe ahu ike ha onwe ha na ekwu. Otu a o bu na a na akuziri umu nwanyi ka ha leta onwe ha ikpeazu, ihe nke a putara bu na ha enweghi oge ga ezuru ha ileta onwe ha. A na ahukwa na otutu mgbe, ihe ezi na ulo nwere na aga na ibu uzo leta umu aka na umu nwoke ezinaulo.

Ihe achoputara bu na o na o ka mma igbochi nsogbu ahuike tupu ha ebido karia igwo ha mgbe ha bidochagoro. Ufodu ihe a ga eme inweta mgbochi adighi onu, ndi ozo di onu, chokwaa nnukwu oge and ego ma e bidochaa ya. Mana otu a o bu na mgbochi oria na ebulite ike nwanyi, ezi na ulo ya na ndi obodo ha n’odiniihu, ndu na emechaa ka mma maka ya.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010202