Kedu ka m ga esi gbanari infekshon Tetanuus

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_gbanari_infekshon_Tetanuus

Tetanuuz bu nje na egbu egbu. Nwanyi nwere ike ibute Tetanuus o buru na nje n’ebi na nsi mmadu ma o bu anumanu banye ya na ahu site na ebe omeruru ahu. Obunadi na onye obula nwere ike ibute Tetanuus, oka njo n’ebe umu nwanyi na umu aka no, okachasi na imu nwa. Tetanuus ga abanye na ahu nwanyi ma o buru na igwe oru obula eji amu nwa a na asaghi nke oma banyere n’ime akpa nwa ma o bu ejiri ya bepu placenta.

N’igbochi nke a, umuaka nwanyi and umu nwanyi niile di ime kwesiri ka agbaa ha ogwu Tetanuus. Nwanyi di ime ma o natabeghi ogwu a, o kwesiri ikwunu, ka enye ya ogwu a na ante natal mbu o gara. A ga agbazi ya nke abua ma otu onwa gachaa. O kwe omume, o kwesiri isoro usoro a:

  • Nke ato opekatampe onwa izizi o ji gbaa nke abuo gachaa
  • Nke ano, opekatampe otu afo o ji gbaa nke ato gachaa
  • Nke isii, opekatampe otu afo o ji gbaa nke ano gachaa
  • O bido gbawazie ogwu a otu ugboro na afo iri.
Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010211