Kedu ka m ga esi gbochie nsogbu na eso ahuike uche mmadu site na ime ka mu onwe m gbadosie ike

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_gbochie_nsogbu_na_eso_ahuike_uche_mmadu_site_na_ime_ka_mu_onwe_m_gbadosie_ike

Umu nwanyi adighi eweputara onwe ha oge otu ha si emere ndi ozo, mana nwanyi obula kwesiri idebe nsogbu na akuku, meere onwe ya udi ihe na amasi ya okachasi udi ihe o dighi eme oge obula, di ka inoro onwe ya, izutara onwe ya ihe, ya na enyi ya isi nri wee diri gawa. Ihe ndia dicha mkpa.

Iwe na ewe gi, ruo obere oru ihe oruru. Dee ihe di ka poem, ma o bu egwu, ma o bu akuko ma o buru na o na ahia gi aru ikoro mmadu ihe na eme gi. Ufodu na ese ihe, iji wepu obi na ihe na eme.

Gbalia hu na gburu gburu ebe obibi gi na enye gi onu, dozie ya otu o ga esi masi gi ma hu na ikuku nwere ebe o si abata.

Tinye ihe mara mma na akuku gi, nke a nwere ike ibu fulawa n’ulo gi, na akpo egwu, na eleghari anya.

Na eme udi ihe ga enyere gi aka ikwalite mgbadosike gi. Otutu obodo nwere ihe ha na eme iji wetuo ahu na uche ha. Ufodu na eme yoga, ekpe ekpere, eme mediteshon ma o bu Tai Chi. Ime ihe ndia ge enyere mmadu aka imeri nrugide na ihe isiike di na ndu ya.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011512