Kedu ka m ga esi ghara inwe mmeko n’ime oyim na ayi

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_ghara_inwe_mmeko_n%E2%80%99ime_oyim_na_ayi

Inwe mmekorita nwoke na nwanyi nwere ugwu na ihunanya na ewe oge na ntukwasi obi n’etiti mmadu na abo no n’ime ya. Mmeko abughi so otu esi egosiputa ya. Obughi naani otu i ga esi gosi na ibu onye ahu n’obi. Inwe mmeko aputaghi na onye ahu ahugbuo gi n’anya.

Unu nwere ike inoko onu na enweghi mmeko. Ikpa nkata na ikoro onwe unu akiko ndu unu ga eme ka unu ghota onwe unu nke oma. Ghota otu unu si ahu uwa na ihe na eme n’ime ya, ghota ihe unu choro inweta na odiniihu. Imetu onwe unu aka (na abughi iji ya nwe mmeko) ga enyenwu afo ojuju na onwe ya. O dighi ihe o mere ma o buru na omeghi unu enwe mmeko mgbe i na achoghi.

Soro onye o bu gi na ya kpaa nkata. O buru na odoro gi anya na o bu onye ichoro ma ichoghi inwe mmeko, kpaa nu nkata o tu unu ga esi chere. Inwere ike ihu na odighi njikere inwe mmeko na onwe ya. Unu abuo nwee nsopuru nyere onwe unu, ihe a agaghi aburu unu nsogbu.

Soro ndi enyi gi kpaa nkata, inwere ike ihu na ufodu n’ime ha na agabiga otu ihe ahu. Unu ga enwe ike inyere onwe unu aka ihu otu unu ga esi nwe mmekorita juru na anuri na enweghi mmeko n’ime ya. Uche gi di ya ma i na enwete ndumodu na aka oyi gi ma o buru na ya onwe ya na enwe mmeko. O nwere ike igwa gi mee ya n’ihi na ya onwe ya na eme ya. A na akpo ya ‘peer pressure’.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020812