Kedu ka m ga esi kpebie gbasara enyi nwoke na mmeko

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_kpebie_gbasara_enyi_nwoke_na_mmeko

Otutu ndi na eto eto na ebido inwe mmetuta banyere ihunanaya na mmeko ma ha na eto. Iche echiche maka imetu mmadu aka ma o bu mmadu imetu gi aka enweghi ihe mere ya. Ufodu umu nwanyi nwere ike iche maka nwanyi ibe ha otu a. Ndi mmadu na di enwe mmetuta a tupu ha ewere ya mee ihe obula.

Hu na inwere mmeko naani oge ikwetara na idi nkwadobe, na oge ighotara otu iga esi kpuchite onwe gi. Mmeko bu ihe mmadu abuo na eme ya nwere ike kporie na abughi mgbe egwu ma o bu ihere di na ya.

Umu nwanyi na eji mmeko eme ihe di iche iche. Ufodu na eme ya n’ihi na ha choro nwa, ndi ozo maka na o na ato ha uto na enyere ha aka ihu na mmadu choro ya otu ahu. Onwekwara ndi chere na o bu n’ihi na o bu ihe ha kwesiri ime dika nwunye ma o bu oyi nwanyi mmadu. Onwere ndi ji ya agwu ugwo, nwere ndi ji ya anata ego ha ji eri ihe, zuta akwa, chota ebe ha ga ebi.

Onwere ndi obu na enwe mmeko n’ihi na ha chere na o ga eme onye ozo hu na na anya. Oge ufodu, otu enyi ma o bu oyi nwere ike ime mmadu odi ya ka o kwesiri iso ha nwe mmeko mgbe ha na adighi nkwadobe.

Onweghi onye kwesiri inwe mmeko ma o buru na achoghi. Nwee mmeko naani oge ikwadoro inwe ya n’ihi na ihe a bu ihe mmadu abuo kwesiri imekonu ma mmadu agaghi emeli ya otu a ma o buru na o na enwe ihere ma o bu na atu egwu ihe di na ya.

O buru na idi nkwadobe inwe mmeko, hu na igbochiri onwe gi ituta ime na ibute oria.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020809