Kedu ka m ga esi kweta na m bu ihe ma o buru na ahu ezuchaghim oke

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_kweta_na_m_bu_ihe_ma_o_buru_na_ahu_ezuchaghim_oke

O buru na udi nwanyi a toro na ulo ebe onwere nkwado ezi na ulo, ulo akwukwu and obodo ya, nkweta o ga enwe na onwe ga adi oke elu ma ahu ya ezuru ezu ma o zughi. Na aka nke ozo, o buru na o toro ebe udi nkwado a adighi ma ncha, o ga acho iru oke oru hu na okwenyere na onwe ya. O bughi ihe mfe ime ma na o bu ihe a ga emenwu.

Ihe mbu i ga eme bu ibido puwa apu, ka i hu ndi mmadu ka ha hukwa gi anya.

Ndi mmadu ndi ozo, okachasi umu nwanyi ndi ozo na amara gi, ha ga ahu na onweghi ihe di iche na gi na ndi mmadu ndi ozo. Oge obula ipuru apu ga eme ya o diri gi mfe ipu apu ozo.

Nke ozo bu isonye n’otu umu nwanyi.

Iso ndi ozo na akpa nkata bu otu di mkpa isi choputa onye mmadu bu na onwe ya. Otu umu nwanyi ga abuli ebe mmadu na enweta udi nkwado a. O ga abuli ebe inwere ike ikwu uche gi na atughi egwu na mmadu ga akpari gi. Na atughi ewu na mmadu ga akooro ndi ozo iha ekwuru ebe ahu.

Inwekwara ike ibido otu umu nwanyi di ka gi ka o nye unu ohere inwe nnoko maka ihe unu na ahu na ndu unu. Unu ga esi otua, kwado onwe unu, nye onwe unu udi nkwado ahu, ndi ozo ekweghi enye unu ma oge amu ma oge akwa.

Ihe ozo unu gara eme bu ikuziri onwe unu etu unu ga esi kwudo chim n’ime obodo. N’uwa niile gbaa gburu gburu, umu nwanyi di otua na abu Dokinta, Loya, Ndi odee akwukwu, Ndi nkuzi, Ndi oru ugbo, Nos, ndi na ere ihe wee diri gawa. Site na enyemaka unu ga enye onwe unu, unu nwere ike ibido kwadowe maka ihe unu ga abu n’odiniihu.

OKWU DI MKPA: Uche unu di naani na ihe unu nwere ike imenwu, ghara ndi ozo.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011105