Kedu ka m ga esi mee mmiri onunu m ka o di ocha

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_mee_mmiri_onunu_m_ka_o_di_ocha

Lee otu inwere ike isi mee mmiri ka o di ocha na adighi oke onu:

Anwu

Anwu nadi egbu ufodu umu nje jogburu onwe ha. Ichoo iji anwu mee mmiri ka o di ocha, buru uzo gbanye mmiri na ihe di ocha, hapu ya n’ilo bido n’ututu ruo na mgbede ehihie. Gbaa mbo hu na idebere nya bu mmiri na mbara ezi ebe ezigbo anwu ka ama ya nke oma. O buru na achoo mmiri osiso, idebe ya na anwu elekere abuo, nya bu 2 awas ezugo ime mmiri ahu ocha. A choo ihu na nje abaghi na mmiri, e kwesiri ibusa ya ebe umu aka ma o bu anumanu ma o bu aja agaghi abata. I choo ka mmiri juo oyii tupu iwere ya mee ihe, bubata mmiri ahu n’ime ulo ka chi foo tupu iwere ya mee ihe ichoro. Inwere ike ihapu mmiri otu abali ma o bu abali abuo na otu odo mmiri ma o bu kontena. Iji anwu eme mmiri ocha bu ihe a na emekari n’akuku uwa ebe anwu na acha waa.

Mmiri oroma nkirisi

Mmiri si na oroma nkirisi na di egbu nje na ebute kolera na umu nne ya oge ufodu. Tinye ngaji nabu n’ime ofu lita mmiri. Rapu ya okala afo tupu inwuo ya.

Isi esi

Isi mmiri esi otu nkeji na egbu nje di na ya. I ga agba mbo hu na esiiri ya otu nkeji tupu ibutuo ya ka o juo oyi. isi mmiri n’oku otua na di eri ihe eji esi nri dika nku ma o bu Kerozin (ihe ndia na di oke onu oge ufodu) nyaabu, were otua mee mmiri ocha ma o buru na inweghi ike iji uzo ndi ozo ekwugoro maka ya.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010118