Kedu ka m ga esi mee skwizin eksersaiz

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_mee_skwizin_eksersaiz

Ihe nke a nwere ike inyere akwara gi nke na eme ka ina anyu mamiri oge obula aka igbake. Bido mewe ya oge i na anyu mamiri. I na anyu mamiri, kwusi inyu ma kpachie ebe ahu. Guruo oge iri, malite inyu mamiri ahu. Mee ihea ugboro ugboro ma i na anyu mamiri. Imuta otu esi eme ihea, na eme ya kwa ubochi. Onweghi onye ga ama na ina eme ya. Gbalie mee ya opekatampe ugboro ano na ubochi, na achiko akwara ahu ebe ise ma o bu iri oge obula.

E nwere ike ime ufodu umu nwanyi opreshon iji kwusi mamiri iputa mgbe o na ekwesighi. O buru na mamiri na apugi n’ahu ma skweezin eksesaiz arughi oru, hu onye okachamalu na ahuike umu nwanyi. Eksesaiz a di mma ka nwanyi obula mee ya kwa ubochi. O na enyere aka idebe akwara ahu ofuma nke na egbochi ufodu nsogbu na odiniihu.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010706