Kedu ka m ga esi nweta ezigbo ihe na odiniihu ndum

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_ga_esi_nweta_ezigbo_ihe_na_odiniihu_ndum

Gbalie hu na itinyere ya uche

Ihe izizi inwere ike ime bu isetipu ihe mgbaru oso. Nkea bu ihe i ga acho ka o mee na ndu gi na ihe i ga eme iji hu na o mere.

Ime udi ihea adighiri ufodu umu nwanyi mfe n’ihi na o bu ezi na ulo ha na ekwu ihe ga eme na ndu ha. Mana inwere ike inyere udi onodu a aka site na imara ihe gi onwe gi choro ime.

Ozo, hu ma inwere ike iso nwanyi ma o bu nwoke na eme ihe i choro ime, kpaa nkata. Onwere ike ibu onye na eme ezi ihe ma o bu onye ndu. Juo ya ma o ga enye gi ohere iso ya na oru ya ka i wee hu ka o si aga.

Oge ufodu, umu nwanyi na enwe nkuda mmuo ha (frustrated) ma o buru na ihe ha choro ibu na ihe obodo ma o bu ezi na ulo ha choro ka ha buru takoo isi. O di mkpa ikowara ha ihe i choro ma gee nti inu uhe ha nwere igwa gi.

Chota onye i ganwu okwu gbasara ihe ndia. O nwere ike ibu oyi gi, nwanne gi ma o bu nwanyi ibe gi. Gwa ha maka ihe ndi na atu gi ujo. Gi na onye ahu ga ahunwu aziza naani gi nwere ike ighara ifu.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020805