Kedu ka m si nwee ike igbochi oria oyi bu Nimonia

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_m_si_nwee_ike_igbochi_oria_oyi_bu_Nimonia

Ezi na ulo nwere ike igbochi Nimonia site na ihu na nwa amuru ohuru nwuru naani ara ruo onwa isii amuchara ya, nakwa site na ihu na nwa na eri nri okwesiri ma gbaa ya ogwu niile e kwesiri igba ya.

Inya nwa ara na enyere aka igbochi nimonia na oria ndi ozo. O di oke mkpa inye naani mmiri ara ruo onwa isii amuchara nwa. Onwa isii gachaa, nwata kwesiri iriwe udi nri ndi ozo na kwa ara iji ihu na o nweta ihe niile ahu ya choro iji kwusiike na enweghi udi oria ndia e kwugoro maka ya. Udi nria bu mkpuru osisi, akwukwo nri, liva, mmanu nri, azu, akwa wdg.

Mmiri onunu na idebe ulo ocha na enyere aka iwetulata infekshon na emetuta ebe eji eku ume na kwa oria ndi ozo di ka afo osisa. Ha bu isa akwukwo nri nwa na eri, idebe ebe a na esi nri ocha, iji ncha na mmiri kwo aka ma o bu iji ntu na mmiri ma o buru na inweghi ncha.

Nwatakiri obula kwesiri igba ogwu niile edenyere ya gbaa. Ogwu mgbochi di oke mkpa; ndi a na agba na afo izizi na abuo amuru nwa kacha di mkpa. Nwa ahu enweta mkpuchite site na mizus, whooping cof, ukwara nta na oria ndi ozo na emetuta ebe eji eku ume na emechaa kpobata nimonia.

Ndi nne na nna na ndi na eleta umu aka kwesiri ihu na umu aka nwoke na nwanyi nwetara ezigbo nri na elekota ahu na kwa ogwu mgbochi. Ndi okachamalu gbasara ihe ndia nwere ike iwetara ndi nne na nna nakwa ndi na elekota umu aka, ozi maka ihe ha kwesiri iri, ogwu ha kwesiri igba na ihe ha ga emegasi igbochi nimonia na oria ndi ozo ga.

Umuaka nwere ike ibute nimonia ma o buru na ha bi na ebe na akwo anwuru oge niile. Ino udi ebe a adighi mma nyere nwata obula tinyere oge adi ime ya. Nwanyi di ime ekwesighi ise ihe osise ma o bu noro ebe anwuru na akwo. Kupu umu aka na ebe anwuru na adi, di ka ebe ana esi nri. Ndi na eto eto kwesikwara igbanahu ise ihe osise ma gwa ndi otu ha na ojogburu onwe ya.

Ikuru anwuru onye ozo na ese dikwaara umu aka njo n’ihi na anwuru ahu na ano n’ikuku ruo otutu awas esechara ya. Ndi na adighi ese ihe osise na ekuru anwuru a n’ikuku na enweli nsogbu ma o bu oria ndi na emetuta ebe eji eku ume di ka infekshon, asthma ma o kwanu kansa.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011603