Kedu ka mgbanwe na ndu m na kwa gburugburu m si nwee ike idobi ezi ahuike uche umu nwanyi

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_mgbanwe_na_ndu_m_na_kwa_gburugburu_m_si_nwee_ike_idobi_ezi_ahuike_uche_umu_nwanyi

Na otutu ebe n’uwa niile, ndi obodo na agbanwe n’ihi ngbanwe na aku na uba obodo ma o bu n’ihi agha. Udi ihe ndia na ebute na ezi na ulo gbanwere buru ihe ozo. Lee akuko na abo a iji matu:

‘Aha m bu Edina. Oge agha bidoro, ndi soja biara jiri ike kpokoro umu nwoke obodo anyi ka ha soro iru ogu. Awakporo otutu umu nwanyi. Anyi ndi foro lachapuru oso gbaga na ugwu dikebere anyi ma o siri ezigbo ike ihu nri oriri. Ugbua anyi bi na refuji camp. Nri anyi ga eri di ebe a mana imirikiti ndi mmadu na aria oria ebe a. Ndi mmadu amaghi juru ebe niile. Ubochi obula a na m aju, a ga m alarukwa ulo mancha mancha?’

‘Aha m bu Jurema. Ala anyi adighi amitazi ihe o tu o siri na mbu. Anyi ga biri ego iji gota mkpuru, na kwa fetilaiza, mana anyi akotaghi ihe anyi ji akwuchi ndi ulo omebe ego ego ha. He mechaa chupu anyi na ala anyi. Ugbu a, anyi bi na ulo gbam gbam di na mpuga obodo anyi. M tete ura ututu obula, mu egee nti mara na mga anu nnunnu ndi na ebe n’isi ututu. Mu bia cheta, nnunnu anoghi ebe a. Ihe m ga aru tata bu ihicharu ndi mmadu ala.’’

Mgbe ezi na ulo ma o bu obodo kewara, ma o bu mgbe uwa gbanwere ruo na otu esiri eme ihe adighizi otu o di na mbu, mmadu nwere ike ibido inwe nsogbu mental helt.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011505