Kedu ka mkpofu ahihia niile otu okwesiri ga esi gbochie oria

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_mkpofu_ahihia_niile_otu_okwesiri_ga_esi_gbochie_oria

Umu ahuhu, Ochicha, Oke ma o bu Nkapi nwere ike ibu uzo nje si efeghari. Umu anumanu ndi a na di ebi ebe a na etufu ahihia dika nri na mkpuru osisi mebiri emebi. Ihu na ezi na ulo niile na gburugburu ha di ocha, na enweghi nsi ma o bu ebe mkpofu ahihia, ma o bu mmiri doro adoro na udi ihe ndi ozo a nwere ike inyere aka gbochie oria. Mmiri ejiri mee ihe n’ulo kwesiri ka a ghafuo ya nke oma site na ime ihe ana kpo sokawa pit ma o bu imepe ebe o ga esi na aga aga.

Ihe di ka Kemikalu, di ka nke eji egbu ahuhu na ulo ubi(farm) banye na mmiri obodo obunadi oburugodi obere banyere ya, o ga abu ihe di oke njo nke ukwuu. Umu Kemikalu a ibanye mmadu n’aka ma o bu na nri mmadu ma o bu na mmiri obodo ga a bu ihe oke njo. Ekwesighi ka akwa, ma o bu ihe niile eji eme Kemikalu di nso ebe mmiri Obodo ma o bu mmiri ezi na ulo di.

Ekwesikwaghi ka Kemikalu di iche iche didebe n’akuku mmiri obodo ma o bu n’akuku nri. Anwakwala anwa were ebe Kemikalu ndia na adi, mere ebe i na edobe nri.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010108