Kedu ka nrugide kwa ubochi ji nwee ike imebi ahuike uche umu nwanyi
Oru ubochi na ihe na eme n’ubochi nadi etinye nwanyi na gbagharia. Nrugide (ma o Stress) ga abianwu site na nsogbu ana ahu anya dika oria ma o bu iru oke oru. O nwekwara ike isi na ihe adighi ahu anya na emetuta uche ya dika ogbaghara n’ezi na ulo ma o kwanu, ibogide mmanu maka nsogbu o na enweghi ike ime ihe o bula banyere ya. Obunadi ihe kwesiri iwete anuri, dika imu nwa ma o bu inweta oru, nwere ike inye nsogbu n’ihi na ha bu ngbanwe bia na ndu nwanyi.
Imirikiti umu nwanyi nwere ihe ndi na enye nsogbu n’akuku niile:
O di mfe ighara ihu nrugide di na ndu nwanyi n’ihi na odi ya ubochi obula. Mana o na nara nwanyi ume iji nagide ihe ndia niile. Mgbe nwanyi no n’ihu oke nrugide, ubochi obula, notee aka ebe ahu, o ga ebido di ya ka o ga ebunwu ibu ahu so ya. Nsogbu a ga aka njo ma o buru na akuziri ya iburu uzo leta ndi ozo tupu olee onwe ya mma. Ka o na enweghi o tu o ga esi zuo ike, kporie ndu - ihe ndi na ewetulata ihe doro ya n’ihu - o nwere ike ileghara anya ihe na egosi ya na ahu adighi ya mma ma o na o na arufe oru oke.
Mgbe ufodu, ndi obodo na eme nwanyi ka o di ha ka ha esighi ike. Mana nke bu ezigbo nsogbu bu nke a: Na nwanyi kwesiri inwe ike ime ihe ndu ha choro iji di mma, ma adighi ekwe ha were ike a bara ihe.