Kedu ka nrugide kwa ubochi ji nwee ike imebi ahuike uche umu nwanyi

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_nrugide_kwa_ubochi_ji_nwee_ike_imebi_ahuike_uche_umu_nwanyi

Oru ubochi na ihe na eme n’ubochi nadi etinye nwanyi na gbagharia. Nrugide (ma o Stress) ga abianwu site na nsogbu ana ahu anya dika oria ma o bu iru oke oru. O nwekwara ike isi na ihe adighi ahu anya na emetuta uche ya dika ogbaghara n’ezi na ulo ma o kwanu, ibogide mmanu maka nsogbu o na enweghi ike ime ihe o bula banyere ya. Obunadi ihe kwesiri iwete anuri, dika imu nwa ma o bu inweta oru, nwere ike inye nsogbu n’ihi na ha bu ngbanwe bia na ndu nwanyi.

Imirikiti umu nwanyi nwere ihe ndi na enye nsogbu n’akuku niile:

  • Ileta nwa
  • Ileta di na ihe o choro
  • Igbata mmiri, ikpa nku,
  • Ihicha ihe
  • Ileta ndi ahu adighi
  • Enweghi ego
  • Enweghi nri
  • Iru oru

O di mfe ighara ihu nrugide di na ndu nwanyi n’ihi na odi ya ubochi obula. Mana o na nara nwanyi ume iji nagide ihe ndia niile. Mgbe nwanyi no n’ihu oke nrugide, ubochi obula, notee aka ebe ahu, o ga ebido di ya ka o ga ebunwu ibu ahu so ya. Nsogbu a ga aka njo ma o buru na akuziri ya iburu uzo leta ndi ozo tupu olee onwe ya mma. Ka o na enweghi o tu o ga esi zuo ike, kporie ndu - ihe ndi na ewetulata ihe doro ya n’ihu - o nwere ike ileghara anya ihe na egosi ya na ahu adighi ya mma ma o na o na arufe oru oke.

Mgbe ufodu, ndi obodo na eme nwanyi ka o di ha ka ha esighi ike. Mana nke bu ezigbo nsogbu bu nke a: Na nwanyi kwesiri inwe ike ime ihe ndu ha choro iji di mma, ma adighi ekwe ha were ike a bara ihe.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011503