Kedu ka o ha niile ga esi gbochie iba

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_ka_o_ha_niile_ga_esi_gbochie_iba

Otita anwunta bu ya na ebute iba, irahu n’ime ulo mgbochi anwunta bu otu kacha mma igbochi Iba.

Onye obula n’obodo kwesiri igbanahu anwunta mana okachasi umuaka na umu nwanyi di ime n’ngbede abali na kwa isi ututu oge anwu nta na ata.

Ulo mgbochi anwunta e ji ogwu anwu kwechiri kwesiri inoruo afo ato na anaghi itinye ya okwu ozo. A na enweta ya ma govment kee ya ma o bu site na ante natal ma o bu na aka ndi kporo ya oru ha inye ya ndi mmadu. Otutu n’ime ha bu ndi a na enye na efu mana inwere ike zuta nke gi na ahia. O buru na enwetaghi nkea, ndi okachamalu ga ekwu ogwu anwunta di mma igba n’ulo gi.

Ulomgbochi anwunta kwesiri na ejiri ya na arahu ura oge obula, tinyere oge anwunta adighi atakebe dika na okochi.

Ufodu mba uwa na di agba okwu mgbochi awunta na akuku ulo wee gbuo anwunta, ndi obodo kwesiri inabata ndi na agba ya ka a hu na agbara ebe niile.

Onwekwara ihe ndi ozo a ga eme iji gbochi Iba mana ha akaghi ulomgbochi anwu nta ike iru oru.

  • Itinye net n’uzo na windo iji gbochi anwu nta. Ana aka eme nke a na obodo mepere emepe, nyabu o nwere ike, a ma enwenwu ya n’ime obodo.
  • Itinye moskito coil. Ndi a na achu ma o naghi egbu anwunta. O naghi anotekwa aka.
  • Iyi akwa ga ekpuchi aka na ukwu gi. nya abu, iyi akwa ogologo aka na uwe nwoda oge anwunta na ata.


Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011705