Kedu kam ga esi chekwaa onwem ma m choo inwe mmeko

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_kam_ga_esi_chekwaa_onwem_ma_m_choo_inwe_mmeko

Ikwado na i choro ibido inwe mmeko, i ga e chekwa onwe gi, iji gbochi ibute oria na afo ime i na achoghi. Uzo ka nku i ga esi nwee mmeko na agaghi etinye gi na gbagharia, mana i ga etinye ya uchu ihu na nke a mere.

Were oche, noro ala kpaa nu nkata tupu unu ebido. Kwa ya ka o ghota udi mkpa odi gi ichekwa onwe gi. O sie gi ike ikwuputa ihea, i nwere ike ime ka i na ekwu maka ndi ozo na ayi oyi. O buru na onye a na eleputara gi anya, o gaghi acho ka ibute oria obula. O buru na o choro inwe mmeko tupu i di nkwadobe, imara na o na elepuru naani onwe ya anya.

Otutu ndi obodo nwere mmadu ndi oru ha bu igwa ndi mmadu otu ha ga esi eme nhazi ezi na ulo ma o bu family planning. Gwa ha okwu ma o bu juo onye okachamalu ahuike ebe i ga enweta nchekwa. O buru na o na eme gi ihere iju, gwa mmadu ya nyere gi aka. Ufodu ulo ahuike nhazi ezi na ulo ma o bu family planning clinics nwere ndi na ahu umunwanyi na eto eto. Ufudu nwekwara ndi na eto eto akuziri oru ka ha nwee ike ileta ndi ogbo ha.

Otu o bu na igaghi ele nwoke anya mara oria o bu, mmeko na aka mma naani oge iji okpu nna bu enyi mee ya oge obula. Oburu na nwoke nwere ihe si ya na ahu aputa ma o bu na o nwere onya ebe obula, i mara na o bu oria i ga eburu ma gi na ya nwee mmeko. Inwekwanu mmeko, bia hu na onwere ihe si gi na ahu aputa, onya na ahu gi, mgbu na mgbada ahu gi, inwere ike ibutago oria.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020813