Kedu kam ga esi zuo ike

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_kam_ga_esi_zuo_ike

Izu ike

Otutu umu nwanyi na aru oke oru. Isi nri, ichu mmiri. Ikpa nku wee diri gawa. O buru na nwanyi a nwere oru ozo n’ilo, i mara na ibu obi erika. O nwere ike iru oru ya niile na ilo, bata na ulo, bido oru ya nke abuo - ileta ezi na ulo ya. Oru nille a ga na ebute ike ogwugwu, oria, erighi ihe na edozi ahu n’ihi na o nweghi oge izu ike ma o bu iri nri buru ibu ka o wee nweta ike iru oru ya nke oma.

O buru na a choo ibutu nwanyi a ibu o bu, ndi ozo no na ezinaulo ahu kwesiri iketa oru nke ha di iche iche n’ulo dika Isi nri, ihicha ulo na isoro umu nwanyii ndi ozo kpata nku. Ndi ozo iso ruwa orua nwere ike ibutu nwanyi ibu obu. Ma nwanyi a o na aru oru oyibo ma o na azu ahia, umu nwanyi niile kwesiri ka enyere ha aka ichekwa umu aka. Ufodu umu nwanyi na enyere onwe ha aka ileta umu aka ka ndi ozo nwee ike iga oru. Ha nadi akwado ka ndi niile choro udi a kwuta ugwo maka ya.

Nwanyi di ime kwesiri inwe ezigbo ezumike. O nwere ike ikowara ezi na ulo ya ihe mere oji choo ezumike ma gwakwa ha ka ha nyere ya aka ruo ufodu oru.

Mmeghari ahu maka ahuike ma o bu Eksesaiz.

Otutu umu nwanyi na enweta mmeghari ahu maka ahuike ma o bu eksesaiz ma ha na aru oru ubochi ha. Mana oburu na nwanyi enweghi ike imeghari ahu ma o na aru oru, n’imatu, o buru na oru ya bu na ofis nke na eme ya o noro ala otu ebe, nwanyi a kwesiri ihu na o na enwe oge o na agaghari agaghari ma o bu gbatia ahu kwa ubochi. Ime nkea ga eme ka Obi ya, Akpa ume ya na Okpukpu ya gbasie ike. O buru na so ihe mmadu na eme bu ikwu oto ma o bu inoro ala otu ebe kwa mgbe kwa mgbe, ogaghi adiri ahu onye ahu mma no odiniihu. Mgbe ufodu ihe a ga ebute nsogbu ozigbo ozigbo. Nsogbu ndia bu ndi a gaara igbochi.


Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010203