Kedu nghotahie na eso ahu mmadu ezuchagi oke

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_nghotahie_na_eso_ahu_mmadu_ezuchagi_oke

Otu n’ime umu nwanyi iri nwere disability na emetuta otu ha si ebi ndu. O nwere ike iji mkporo aga ije, nwee ike odighi ahu uzo, nwekwa ike uche ya agaghi emeli ihe o choro ka o mee, wee diri gaba.

Na amokwu nke a, anyi ga ekwu maka umunwanyi na ebi ndu n’ime ahu na ezuchaghi oke. A nyi agaghi akpo ha ‘disable’. Ihe anyi ji eme nke a bu iji kowara oha na eze na obunadi na onwere ihe mere ha na ahu na anaghi ekwe ha mee otu ma o bu ihe abuo, na ndi di otua bukwa mmadu ka ndi ibe ha. Ha bu nwanyi tutu ha aburu ndi ihe mere.

Na agbanyeghi ihe o bu ya kpatara ihe mere nwanyi na ahu ya, nwanyi ahu ezughi oke na nwanyi ahu zuru oke bu otu ihe. Ha abuo di mkpa, ihe nke ozo choro bu ohere iji gbanwee ndu ya.

Ufodu ndi obodo na enwe nghotahie gbasara disability. Na imaatu, ufodu ndi na ekwu na ihe na ebute ya bu ihe nwanyi mere n’ uwa ya izizi ka o na ata afufu ya ugbu a. Ndi ozo na eche na o na efe efe nke mere ha na agbara umu nwanyi di otu a oso. O bughi ihe ndia na ebute ya ma ncha.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011102