Kedu oge di mma ikwusi inye nwa ara

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_oge_di_mma_ikwusi_inye_nwa_ara

Inwere ike inye nwa nri ndi ozo:

  • Oge o ruru onwa isii
  • Mgbe o bidoro zowa nri ndi ozo azo
  • Ma o buru na odighi agbuputa nri enyere ya

Nwa di afo site na onwa isii ruo otu afo, nye ha ara oge obula o choro ya. Enyekwala ya nri ndi ozo bido na oge amuru ya ruo onwa ano. O na erigodu nri ndi ozo na onwa ano, o kwesiri ika na anwu ara. Inyewe ya nri ndi ozo, bido ugboro abuo ma o bu ato. Were nri di nro bido dika siril ma o bu porage. Ufodu umu nwanyi na etinye mmiri ara na ime ihe ndi a. O bughi iwu na iga egote siril di oke onu.

Nwa na aidghi acho imi ara nwere ike ihe o choro bu imuta etu esi amiri ya nke oma, omee nkea, ara nne ya ga agba nke oma. Nne nwa a kwesiri inye ya ara otu obula o choro mkpuru ubochi ise, o ka na ebe akwa, i mara na nne nwa a nwere ike igbali nye nwa a nri ozo mara ma o ga eri. Pikooro nwa nri obula o bidoro iri na abughi ara nke oma ruo mgbe nwa nwere ike iji aka ya tawa nri ata. Were iko na ngazi nye nwa nri.

Umu aka na acho iri nri oge obula - mgbe ufodu ugboro ise n’ubochi. Ha kwesiri iri ezigbo nri kwa ubochi di ka porage, wit, osikapa, poteto, milet na ndi ozo. E kwesiri itinye ha nri na edozi ahu bu agwa, granot akworo akwo, akwa, chiizi, azu ma o but anu, akwukwo nri nwere ike imasi ha, na mkpuru osisi, tinyere nri ndi na enye ike dika garnot akworo akwo, obere mmanu eji esi nri. Ikwesighi iji maka nwa na eri nri ugboro ise sie nri ugboro ise, otutu nri di inwere ike inye ya na ndu dikwa mma oriri.

Nye nwa nri ohuru n’otu n’otu. Enyela ya ha ncha ozugbo. Mgbe nwa di ebe onwa itenaani, o nwere ike isoro onye obula rie ihe ha na eri ma o buru na emere ya otu o ga erinwu ya.

Mmiri ara na aga n’ihu inye nwa gi mkpuchite ka o di afo nabo. Okwe gi omume, gaa n’ihu na inye nwa ara ruo oge odi ebe afo abuo, o buru godi na imuru nwa ozo. Otutu umu aka na eji aka ha akwusi ara.


Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010807