Kedu oghom di na inye nwa nri na abughi ara

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_oghom_di_na_inye_nwa_nri_na_abughi_ara

Ego bu ihe mere ndi Kompin na eme fomula ji choo ka umu nwanyi ghara inye nwa ara ma nye ha formula. Inye nwa ihe ahu adichaghi mma. Imirikiti umu aka enyere fomula, ghara ahu, ufodu enweteghi iha ahu ha choro, onwekwara ndi nwurunu.

Fomula na ndi otu ya dika mmiri ara umu anumanu enweghi nchekwa obula o na enye umu aka. Ha nwere ike ikpata oria ma o bu onwu. O buru na iko ma o bu mmiri e ji eme ya asughi nke oma, nwa nwere ike inwute nje na enye Dayaria.

Otu nwa si ami ara na otu o si anwu fomula na botul abughi otu ihe. O na eme nke ikpeazu a, nwa ahu agaghi amuta otu okwesiri si i na ami ara. Nwa na adighi ami ara ga eme ka mmiri ara nne ya kwusi igba kpamkpam.

Inye nwa fomula bu ihe ego. Otu nwa ga eli kilogram iri ano n’afo izizi. Ikpata ego eji ego fomula nakwa nke eji esi mmiri oku eji asa botulu nwa ga eri ezigbo ego. Otutu ezi na ulo na eji ihi ego, wetulata aka na fomula ha na enye nwa ha, nkea na ebute nwa enwetegi nri ahu ya ji eto, nwa iria ahu na kwa nwa anaghi eto otu okwesiri.

OKWU DI OKE MKPA: Nwanyi bu HIV ga agbali hu otu ka mma o ka eji nye nwa ya nri. Nwanyi obula nwere HIV kwesiri iso onye ahuike kpa nkata maka okwu a.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010804