Kedu otu esi kwesi idebe nri nke oma maka umuaka

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_otu_esi_kwesi_idebe_nri_nke_oma_maka_umuaka

Ekwesiri ikpachapu anya nke ukwu ma emewe nri umuaka na ndi amuru ohuru. Ekwesiri ime nri ha ma nyekwaha ya ozugbo ozugbo na ahapula ya ka o di adi.

Mmiri ara bu nri kacha mma, o bu ya kacha na enye ihe na ahu umu aka. Ekwesiri idebe mmiri ara agbaputara agbapu na ebe na ajughi oyi ma o bu ihe a na akpo, rum temperecho ruo elekere asato na ihe ekpuchiri ekpuchi. O buru na a na enye umu aka ndi toro obere eto mmiri ara ehi, si hu na esiri ya n’oku otu o nwere ike isi gbuo njonjo na njonjo di ya n’ime nwere ike imeru mmadu ahu.

Nri esibeghi esi ma o bu nri eriforo erifo nwere ike imeru mmadu ahu. Ekwesiri isa nri esibeghi esi asa ma sie ya. Nke esigoro esi kwesikwara ka erie ya ozugbo ozugbo ma o bu dakwa ya n’oku tupu erie ya ozo.

Ekwesiri isi anu okuko esi ka o ghee ofuma ofuma ka e we gbanahu oria bed flu.

Ekwesiri imecha, were mmiri di ocha saa mkpuru osisi na akwukwu nri nke oma okachasiri ma oburu na umu aka ga eri ha na ndu. A na adi eji kemikal enyere mkpuru osisi na akwukwo nri aka na ito eto, ihe ndia na adi njo ma asachapughi ha n’aru ihe ndi a. Ekwesiri iji ncha na ogbo kwuo aka ma emetuchaa nri esighi esi aka. Nri esibeghi esi, okachasi okuko na nri esi na mmiri guputa nadi ebu nje. Nri esiri esi nwere ike ibute nje ma o metuta nri esighi esi. Nje ndia nwere ike imu umu na nri ahu esiri esi na eteghi aka. O bu nkea kpatara nri ndu na nri esiri esi ekwesighi idi otu ebe.

Esichaa nri, ekwesiri iji mmiri na ncha sachaa mma na ihe ndi ozo e jiri sie nri ahu ocha

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010126